settings icon
share icon
Ajụjụ

Gịnị kà ọ pụtara ịnābàtà Jizọs dịka Onyenzọpụta ǹke onwe gị?

Azị̀za


Ị̀ natawo Jizọs dịka Onyenzọpụta ǹke onwe gị? Iji ghọta ajụjụ a etu ziri ezi, ị gà-èburịrị ụzọ̀ ghọta okwu ndị a “Jizọs Kraịst,” “nke onwe” nà “Onyenzọpụta.”

Ònye bụ̀ Jizọs Kraịst? Ọtụtụ mmadụ gà-ànabàta Jizọs Kraịst dịka nwoke ọma, onyenkụzi ukwu, maọbụ kwàzì onyeamụma Chineke. Ihe ndị a bụ̀ eziokwu wēre anya banyere Jizọs, mana ha anaghị àkọwa n’ùju onye Ọ bụ n’eziokwu. Akwụkwọ Nsọ na-agwa anyị nà Jizọs bụ Chineke dị̄ n’anụāhụ, Chineke dị n’ụdị nke mmadụ (lèe Jọn 1:1, 14). Chineke bịara n’ụwa ịkụziri anyị ihe, gwọọ anyị, duzie anyị, gbaghàra anyị - ma nwụọ maka anyị! Jizọs kraịst bụ Chinēkè, Onyeòkìkè, Onyenwenụ/Dinwenụ ike Ya kachasị ihe niile. Ị̀ narala Jizọs à?

Gịnị bụ Onyenzọpụta, gịnị kwa kpatara nà anyị nwere mkpa maka onyenzọpụta? Akwụkwọ Nsọ na-agwa anyị na anyị niile emehiewo; anyị niile emeela ihe ndị dị njọ (Ndị Rom 3:10-18). N’ihi mmehie anyị, anyị kwèsị̀rị̀ iwe nà ikpe Chineke. Naanị otu ahụhụ kwesịrị èkwesị maka mmehie e mèrè megide Chineke enweghi ngwụcha nā-adịgide bụ ahụhụ mmehie enweghi ngwụcha (Ndị Rom 6:23; Nkpughe 20:11-15). Ya kpàtàrà na anyị nwere mkpa maka Onyenzọpụta!

Jizọs Kraịst bịara n’ụwa nwụọ ọnwụ dịịrị anyị. Ọnwụ Jizọs bụ ụgwọ enweghi ngwụcha (a kwụrụ) maka mmehie anyị (2 Ndị Kọrịnt 5:21). Jizọs nwụrụ iji kwụọ ụgwọ ntaramahụhụ mmehie anyị (Ndị Rom 5:8). Jizọs kwụrụ ya bụ ụgwọ ka anyị wee ghara ịkwụ ụgwọ. Mbilite Jizọs site na ndị nwụrụ anwụ gosìpụ̀tàrà nà ọnwụ Ya zuru ikwụ ụgwọ ahụhụ mmehie anyị. Ya kpàtàrà nà Jizọs bụ otu Onyenzọpụta ahụ nke naanị Ya bụ (Jọn 14:6; Ọlụ Ndị Ozi 4:12)! Ị̀ nà-àtụkwàsị obì nà Jizọs dịka Onyenzọpụta gị?

Jizọs ọ̀ bụ̀ Onyenzọpụta “nke onwe” gị? Ọtụtụ mmadụ na-elegara ịbụ Kristian anya dịka ịga ụka, imegasị ihe ndị a na-eme n’okpukperchi, nà/maọbụ anāghị èmegasị mmehie ụfọdụ. Nke ahụ abụghị ịbụ Kristian. Ịbụ Kristian nke bụ̄ eziokwu bụ̀ mmadụ na Jizọs Kraist inwe mmekọrịta nke onwe. Ịnabata Jizọs dịka Onyenzọpụta nke onwe gị pụtara itinye okwukwe nà ntụkwasịobi nke onwe gị nà Ya. Ọ dịghị onye a nà-àzọpụta site n’okwukwe ndị ọzọ. Ọ dịghị onye a nà-àgbaghara site n’imegasị ihe ufọdụ. Naanị ụzọ e si ènwete nzọpụta bụ ijìrì aka nke onwe gị nabata Jizọs dịka Onyenzọpụta gị, na-àtụkwasị obi n’ọnwụ Ya dịka ụgwọ (a kwụrụ maka) mmehie gị nà mbilite n’ọnwụ Ya dịka ihe na-enye gị nkwa na-eme ka obi sie ike nke/maka ndụ ebighi ebi (Jọn 3:16). Jizọs, Ọ̀ bụ Onyenzọpụta gị, dịka nke onwe gị?

Ọ bụrụ na ị chọrọ ịnabata Jizọs Kraịst dịka Onyenzọpụta nke onwe gị, gwa Chineke okwu ndị a nā-eso. Cheta, ikpe ekpere à maọbụ ekpere ọbụla ọzọ agaghị azọpụta gị. Naanị ikwere nà Jizọs Kraịst nà ọrụ Ya n’obe maka gị nke gwụwororịị agwụ pụrụ ịzọpụta gị site na mmehie. Ekpere à bụ naanị ụzọ iji gosi Chineke okwukwe gị n’ime Ya ma kelee Ya maka ọnọdụ O mè̀̀̀̀̀bèrè maka nzọpụta gị. “Chineke, amà m na emehiela m megide Gị ma kwesi (ǹtàràm)ahụhụ. Mana ekwere m na Jizọs Kraịst nààrà (ǹtàràm)ahụhụ ahụ̄ kwesịrị m ka o wee bụrụ nà site n’okwukwe nà Ya e nwere ike ịgbaghara m. Ana m anara onyinye Gị nke (bụ) mgbaghara mmehie, ma na-etinye ntụkwasịobi m na Gị maka nzọpụta. Ana m anabata Jizọs dịka Onyenzọpụta nke onwe m! Ekele dịrị Gị maka amara na mgbaghara mmehie Gị dị ebube – onyinye nke ndụ ebighi ebi! Amen!”

Ọ̀ dịla mkpebì i mèrè nye Kraịst n’ihi ihe ị gụ̀rụ̀là n’ebe à? Ọ bụrụ nà ọ dị etu ahụ, biko kụ̀tụrụ maụ̀sụ̀ nà bọtịn “anabàtala m Kraist taa” dị n’okpuru.

English



Laghàchi n’ihuakwụkwọ nke jikọtara ndị ọzọ

Gịnị kà ọ pụtara ịnābàtà Jizọs dịka Onyenzọpụta ǹke onwe gị?
© Copyright Got Questions Ministries