settings icon
share icon
Ajụjụ

Gịnị bụ onye Kristian (onye nke Kraịst)?

Azị̀za


Nkọwa nke akwụkwọ ọ̄kọwa okwu (dikshọnarị) nyere maka onye Kristian gà-àbụ ihe yitere “onye na-egosipụta nkwenye nà Jịzọs dịka Kraịst ahụ maọbụ n’òkpukperechī gbadoro ụkwụ na nkụzi ndị nke Jizọs.” Ebe nke a bụ̀ ebe mmalite dị mmā, dịka ọtụtụ nkọwa okwu nke ọkwụkwọ ọkọwa okwu (dikshọnarị), o bèrè ihe rute n’ebe o ruru, n’ịkụzi n’ezie eziokwu nke Akwukwọ Nsọ maka ihe ọ pụtara ịbụ onye Kristian. E jiri okwu ahụ bụ “Kristian” mee ihe ugboro atọ na Testament Ọhụụ (Ọlụ Ndịozi 11:26; 26:28; 1 Pita 4:16). A kpọrọ ndị na-eso ụzọ Jizọs “ndị Kristian” mbụ n’Antịọk (Ọlụ Ndịozi 11:26) màkà nà òmùme ha, ihe ndị ha nà-ème, nà okwu ha dị̀ kà Kraịst. Okwu ahụ bụ “Kristian” na nghọta mkpurụokwu ya, pụtara “isò n’òtu nke Kraịst” maọbụ “onye na-eso ụzọ Kraịst.”

Ọ dị mwute na dịka ogē nà-àgata, okwu a bụ̄ “Kristian” etufuola ihe buru ibu n’ihe ọ pụtara wee bụrụ ihe a nà-eji èkwube na mgbe nà mgbe maka onye na-ègosipụta okpukperechi maọbụ nwee ezi ndụ sitere n’ezi akọnauche n’ogo dị elu, mana o nwere ike ọ bụrụ maọbụ ọ bụghị onye na-eso ụzọ Jizọs Kraịst n’eziokwu. Ọtụtụ mmadụ ndị ekweghi na Jizọs Kraịst, ná-àtụkwasịkwa obi na Ya, nà-àhụta onwe ha gasị ka ndị kristian naānị maka nà ha nà-àga ụkà maọbụ na ha bi na mbā bụ̄ nke “Kristian”. Mana ịga ụkà, ijere ha bụ̄ ndị enwerughi ihuọma kà gị onwe gị ozi, maọbụ ịbụ ezigbo mmadụ anaghị eme gị onye Kristian. Ịga ụkà anaghị eme gị onye Kristian ma ncha karịa etu ịga n’ebe a nà-àkwụba ụgbọàla sì ème gị ụgbọàlà. Ịbụ̄ onyeòtu ǹkè otù ụkà, na-àgachite òfùfè anya, na-ènyekwa ihe maka ọrụ ụkà ahụ̀ anaghị eme gị onye Kristian.

Akwụkwọ Nsọ nà-àkụzi nà ezi ọrụ ndị anyị nà-àrụgasị apụghị ime anyị ndị a nābàtàrà nye Chinekè. Taịtọs 3:5 nà-àsị “O siteghi n’ọlụ dị icheiche a lụrụ n’eziomume, nke anyị onwe anyi lụrụ, zọpụta ayị, kama dịka ebere Ya si dị, site n’ọsịsa nke ịmụ̄ ọ̀zọ na nke imē ọhụụ nke Mmụọ Nsọ nà-ème.” Ya mèrè, onye Kristian bụ onye Chineke mụ̄woro ọ̀zọ (Jọn 3:3; Jọn 3:7; I Pita 1̃:23) nke tinyeworo òkwùkwe na ntụkwasịobi nà Jizọs Kraịst. Ndị Efesọs 2:8 nà-àgwa anyị na ọ bụ “… àmàrà kà e jīwòrò zọpụta ụnụ, site n’òkwùkwe; nke a esiteghikwa n’onwe ụnụ: ọ bụ onyinye Chineke.”

Ezi onye Kristian bụ onye tinyeworo okwukwe na ntụkwasịobi na mmadụ nke Jizọs Kraịst na ọrụ ya, tinyere ọnwụ Ya n’obe dịka ụgwọ Ọ kwụrụ maka mmehie nà mbilite n’ọnwụ Ya n’ụbọchị nke atọ ya. Jọn 1:12 nà-àgwa anyị “ma kà ha rà bụ ndị naāra Ya, ha kà O nyèrè ike ịghọ ụmụ Chineke, bụ ndị kweere n’aha Ya.” Akàra nke ezi onye Kristian bụ ịhụnanya nye ndị ọzọ nà nrubeisi nye Okwu Chineke (1 Jọn 2:4, 10). Ezi onye Kristian bụ nwa Chineke n’ezie, bụrụ akụkụ ezi ezinaụlọ nke Chineke, nà onye e nyeworo ndụ ọhụụ n’ime Jizọs Kraịst.

Ọ̀ dịla mkpebì i mèrè nye Kraịst n’ihi ihe ị gụ̀rụ̀là n’ebe à? Ọ bụrụ nà ọ dị etu ahụ, biko kụ̀tụrụ maụ̀sụ̀ nà bọtịn “anabàtala m Kraist taa” dị n’okpuru.

English



Laghàchi n’ihuakwụkwọ nke jikọtara ndị ọzọ

Gịnị bụ onye Kristian (onye nke Kraịst)?
© Copyright Got Questions Ministries