Jizọs Ọ̀ bụ̀ Chineke? È mèkàtàrà nwee mgbe Jizọs kụ̀ọ̀rọ̀ nà Ya bụ̀ Chineke?




Ajụjụ: Jizọs Ọ̀ bụ̀ Chineke? È mèkàtàrà nwee mgbe Jizọs kụ̀ọ̀rọ̀ nà Ya bụ̀ Chineke?

Azị̀za:
Ọ dịghị mgbe e dèrè Jizọs n’Akwụkwọ Nsọ dịka Ọ na-ekwu kpọmkwem okwu ndị a, “abụ M Chineke.” N’atụmasịghị ya, nke ahụ apụtaghị na Ò kwuputaghị nà Ya bụ Chineke. Wère okwu Jizọs nà Jọn 10:30 dịka ọmụmaatụ, “Mụ onwe m nà Nna M bụ otù.” Naanị ile anya n’etu ndị Juu siri kpachighaa agwa nye okwu Ya, kà anyị chọrọ iji mara na Ọ na-akụ̀rụ ịbụ̄ Chineke. Ha chọ̀rọ̀ ịma Ya okwute n’ihi otù ihe à. “… Gị onwe gị, ebe Ị bụ mmadụ, Ị na-eme onwe Gị Chineke” (Jọn 10:33). Ndị Juu ghọ̀tàrà kpọmkwem ihe Jizọs nà-akụ̀rụ - chi. Hụ̀wa amā nà Jizọs anaghị àgọ àgụ̀gọ̀ okwu Ya maka ịbụ̄ Chineke. Mgbe Jizọs kwupụtara, “Mụ onwe m nà Nna M bụ otù” (Jọn 10:30), Ọ nà-èkwu na Ya na Nna ahụ nwere otù ọ̀dịdị nà njirimara kacha mkpa. Jọn 8:58 bụ ọmụmaatụ ọzọ. Jizọs kwupụ̀tàrà, “n’ezie, n’ezie, asị M ụnụ, mgbe a ka amughị Abraham, Mụ onwe M dị!” Nzaghachi nke ndị Juu nụ̄rụ okwu à bụ ịtụ̄tụ̀tà okwute ka atụgbuo Ya maka nkwulu/nkwutọ, dịka iwu Moses nyere ha iwu ka ha mee (Levitikọs 24:15).

Jọn kwunwòkwàrà echiche nke chi Jizọs bụ: “Okwu ahụ bụrụ kwa Chineke” nà “Okwu ahụ wee ghọ̀ọ anụahụ, bụ mmadụ” (Jọn 1:1, 14). Amàokwu ndị a na-egosi n’etu were anya nà Jizọs bụ Chineke dị̄ n’anụahụ. Ọlụ Ndịozi 20:28 nà-àgwa anyị, “ka ụnụ na-azụ nzukọ Chineke dịka atụrụ, nke O ji ọbara nke Ya onwe Ya zụtara onwe Ya.” Ònye zụtara nzukọ Kraịst (nzukọ ụka/nsọ) – nzukọ Kraịst nke Chineke – site n’ọbara Ya? Jizọs Kraịst. Ọlụ Ndịozi 20:28 nà-èkwupụ̀ta nà Chineke jiri ọbara nke onwe Ya zụrụ nzukọ Kraịst. N’ihi nke a, Jizọs bụ Chineke!

Tọmas onyeozi kwupùtàrà gbasara Jizọs, “Onyenwe m nà Chineke m” (Jọn 20:28). Jizọs anaghị èduzi/agbàziri ya. Taịtọs 2:13 nà-agbā anyị ume ichere maka ọbịbịa nke Chineke nà Onyenzọpụta anyị, Jizọs Kraịst (lekwuo 2 Pita 1:1). Na Ndị Hibru 1:8, Nna ahụ nà-èkwupụta maka Jizọs, “ma Ọ nà-èkwu ihe banyere Ọkpara ahụ, sị, Ocheeze Gị, Chineke, nadịru mgbe niile ebighi ebi; m̀kpànaka eze nke izi ezi ka m̀kpànaka nke alaeze Gị bụkwa.” Nna ahụ nà-àkọwa Jizọs dịka “Chineke” na-ègosi nà Jizọs bụ Chineke n’eziokwu.

Na Nkpughe, otù mmụọozi gwara Jọn onyeozi kà ọ kpọọ isi ala nye naanị Chineke (Nkpughe 19:10). Ọtụtụ mgbe n’Akwụkwọ Nsọ Jizọs nà-ànara ịkpọ isi ala (Matiu 2:11, 14:33, 28:9, 17; Luk 24:52; Jọn 9:38). O mekataghị baara ndịmmadụ m̀ba maka ịkpọrọ Ya isi ala. Ọ bụrụ na Jizọs abụghị Chineke, Ọ gààrà àgwa ndịmmadụ ka ha gwàra ịkpọrọ Ya isi ala ọ̀bụnā dịka mmụọozi dị na Nkpughe mèrè. E nwere ọtụtụ amaokwu nà isi edemede gasị nke Okwu Chineke e dere ede ndị nā-ekwu maka ọbụbụ chi nke Jizọs.

Nke kachasị mkpa bụ ihe kpatara na Jizọs kwesịrị ịbụ Chineke bụ na ọ bụrụ na Ọ bụghị Chineke, ọnwụ Ya agaghị ezu ikwụ ụgwọ mmehie dum nke ụwa (1 Jọn 2:2). Ihe e kere eke nwere ndụ, nke Jizọs gààrà abụ ma ọ bụrụ na Ọ bụghị Chineke, enweghi ike ịkwụ ụgwọ ahụhụ enweghi ngwụcha nke a chọrọ maka mmehie e mere megide Chineke enweghi ngwụcha. Naanị Chineke nwere ike ịkwụ ụgwọ ụdị ahụhụ enweghi ngwụcha dị etu ahụ. Naanị Chineke nwere ike ibū mmehie nke ụwa (2 Ndị Kọrịnt 5:21), nwụọ, ma kulitekwa n’ọnwụ, na-ègosi mmeri Ya n’ebe mmehie na ọnwụ dị.



Laghàchi n’ihuakwụkwọ nke jikọtara ndị ọzọ



Jizọs Ọ̀ bụ̀ Chineke? È mèkàtàrà nwee mgbe Jizọs kụ̀ọ̀rọ̀ nà Ya bụ̀ Chineke?